biafrandailynews
MMANYA NGWO

-Ututu oma ,umu Ajaala Igbo.

-Unu araghukwara ofuma? Ka tata mara anyi n’ile mma.

-Kanyi kowatugodi maka mmanya be anyi,mmanya a bu mmanya dika chi siri kee   ya,mmanya si n’ajaala puta.

Image result for igbo palm wine

O na edozi aru ma na emekwa otutu ihe n’ahu anyi,o na asacha anya ,o na enyere nwanyi muru nwa aka igbaju mmiri ara nwatakiri ga añu. Ifugokwanu ukwu (waist) umunwanyi ndi UDI ENUGU STEETI ebe fa n’agba egwu,mmanya n’aru ezigbo oru n’aru umunwanyi. Ijugonu onwe giihe umunwanyi ndi UDI ji añu ajo nkwu?

Try watch their body very well especially their waist ,ka ifu oru aka mmanya ngwo ,maka ufodu umu agbogho anyi si na mmanya n’esi isi ,ufodu kposiri nku jeenu mutanu ka esi añu mmanya ngwo ka aru unu gbanwee.

Our nursing mama’s ,is good for you and your baby ,drink it and your breast will over full for your baby to feed on.Eji mmanya be anyia eme emume,eji ya eme omenaala,obu mmanya a na enye ndiichie anyi.O na adi ike iji ruo oru mmuo ,okachasi nke ike ya emetughi n’ala.

Ndi be anyi ewere n’atu n’ilu si na mmanya adiro ezo ahihia.


Tata bu AFO Agulu,
Tata bu AFO Udo Nanka,
Tata bu Nwa Afo Ogboji,
Tata bu AFO Akawa Nneato,
Tata bu Afo Ufuma,


Asim ka AFO tata fotara anyi ihe oma ,ya fopuru anyi ihe ojoo, ya fogbuoro anyi odachi ma foputara anyi ogologo ndu n’ahu ike.

Tata bu AFO bu ubochi ezigbote oyim amuru ubochi afo(NWAFO),ka ogwugwu Agba nwe gi chekwaba gi, n’alulu gi ogu mmuo na nke ihie.

Ala Agba Ekwulobia na Ajaala Ekwulobia dobe gi ogologo ndu ma nye gi aru ike, onyeisi n’awaja. 


Umu Ajaala Igbo Ijele ekelekwa unu ozo,ututu oma nu oooo. Ka ugboguru miara m ya miara nwunye dim.

Ndu azu ndu mmiri,mmiri atala ma azu anwula,ndu okenye ndu nwata. Egbe belu ugo belu ,nke si ibe ya ebela ka Nku kwaa ya. Isi oma na ije awele,ka ukwu anyi ji ga alota Kara nke anyi jiri puo mma.
Iseeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!!!!!!!

Edemede  Nkea Bu Nwata Nwa Ada: Chidimma Ofoegbu Dele Ya.